Saturday 3 October 2015

We Must Promote Igbo Language ( Asus bu isi omenala)-Ifeduba


Asụsụ bụ isi omenala




Omenala Igbo ga-adị ọkpụtọrọkpụ n’ihi na ọ bụ ngu anyị bụ ndị Igbo ji eko, ọ gaghị akwalahị anyị. Anyị agaghị eme omenala ma hapụ iji asụsụ Igbo buru ụzọ. Ka anyị were ịwa ọjị Igbo maatụ, ọjị bụ ụzọ Igbo si ekpe ekpere na isimbido ihe ọ bụla ha na-eme, nke bụ sọnsọ Igbo ka e ji agọ ya. A sụwa bekee sụchaa, onye ọ bụla ọjị danyere n’aka ga-ejisi ike were Igbo gọọ ya, tupu ọ waa ya. Ọjị ọ bụla e jiri bekee wa aghọla gworo n’ihi na ọjị a gọchiri ntị, mmụọ anaghị ata ya. A naghị ahapụ omenala mebe omenelu maka na a naghị agbawa ụrịọm hapụ isiaka.
Ọ kwa ọ na-abụ ejula kpụrụ, ọ kpụrụ ikikere ya, a mụrụ anyị dịka ndị Igbo, asụsụ anyị bụrụ Igbo. Ka anyị na-àzọ́ onwe anyị, ka anyị ga na-azọkwa asụsụ anyị bụ Igbo n’ihi na ọ bụ dike na-azọ ala, ala a na-azo dike. Anyị agaghị anọ bekee agbagbuoro anyị ya n’ime osimiri maka na okenye anaghị anọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbịrị. Ọ bụrụgodị ndị o nweghị ihe gbasara ha na asụsụ anyị bụ òtù UNESCO na-eti mkpu na-akpọku ndị Igbo, na-eti na Igbo ga-ada mmiri tupu iri afọ ise na-abịa abịa. Mkpu a ha na-eti na-efe ndị Igbo efe na ntị. Ndị Igbo ibe m, ọ naghị adị mma ọ dọbie ezokọọ n’ihi na ọ dịghị ezuzi òkè.
Gerekene akụkọ a were ya mara uru ụtọasụsụ Igbo bara na ndụ anyị. Ótù enyi m bi n’ala ndị bekee ka ya na ezinaụlọ ya gara oriri n’ụlọ akwụkwọ ada ya nwanyị. Ada ya so na onye a kpọpụtara ka o soro n’egwuregwu ha chọrọ igwu. Iwu egwuregwu ahụ bụ na ha niile ga na-agba egwu wee na-agba oche okirikiri, ọ bụrụ na egwu kwụsị n’ike, onye ọ bụla ga-agba ọsọ zọta otu oche ọ ga-anọrọ ala. Onye azọtalighị oche apụọla n’egwuregwu ahụ maka na oche adịghị ezu n’ọnụọgụ. Nwanne m nwoke ahụ hụrụ na uche ada ya adịghị n’ihe ọ na-eme wee sụọrọ ya n’olu Igbo, gwa ya ada m, ị na-agba egwu nọrọ oche nso ka i wee nwee ike iso zọta otu oche ọsịsọ ma egwu kwụsị n’ike. Ada ya sara ya na bekee sị ya „No Dad, that’ll be cheating!“ Ndị bekee niile nọ nso tụgharịrị lee nwanne m nwoke ahụ anya ọjọọ, n’ihi na ha aghọtaghị ihe ọ gwara nwata ma ha ghọtara ihe nwata zaghachiri ya azụ. Ụta adịịrịghị nwata ahụ maka na ọ sụọla nke ka ya mfe n’ọnụ. Ka anyị kpọọ ya mkpa ịmụgosi ụmụ anyị ụtọasụsụ Igbo.
Ndị Igbo, oge eruole mgbe anyị ga-akwụsị iji onye kara mara asụ maọbụ ede bekee eme tụụtụụgaagaa, maka na garagara dị mma, ma gadanga bụ agwụ. O ruole oge ndị Igbo ga na-ámà áká onye ga-asụkarị ibe ya Igbo na-etinyeghị ótù mkpụrụ bekee na ya. Ka anyị si ebe ahụ bido ịkwanyere asụsụ Igbo ugwu ruuru ya, hapụ ị na-asụ na ‘my mother gwara m’. Onye ọ bụla buru ọ́gụ̀ ya pụta ka anyị dị n’igwe banyebere Igbo aja n’ukwu ka ọ ghara ịdaru ala maka na ihere ga-abụ nke anyị niile. Oke mmụta anyị na ụtọ ihe nñụñụ ekwekwala ka anyị chezọọ omenala Igbo nke isimbido ya bụ ụtọasụsụ Igbo maka na e wepụ nnu ihe o jiri bụrụ nnu ụtọ ya alaa.
Ndị Igbo, ka anyị turunụ ugo asụsụ Igbo n’ihu isi, ka ọ ga-abụ ọ dapụ, anyị atụtụrụ ya tunyekwa ghara ịhapụ ya ebe ọ dapụrụ. Ọ bụghị onye gafee ogwe ọ sị ogwe gbajie, anyị sụ̀rụ̀ Igbo, gịnị mere na anyị agaghị ahapụ ụmụ anyị ka ha sụwa ya? Arịrịọ m kachasị agara ndị nne maka na ọ bụ nne na-akụziri nwatakịrị asụsụ, ndị nna a na-ákwàdó àkwàdó. Ọ na-abụ ihe ihere ịhụ ebe ụfọdụ ndị nne na ụmụ ha na-asụ bekee n’ụlọ ahịa maọbụ n’okporo ụzọ. Nne nọrọ na-awa bekee ka nkụ, ọnụ nwa ya a na-ebe ya ka agụba agụiyi dị nkọ. Nke a mere anyị ji arịọ ndị nne biko ka ha na-agba ḿbọ̀ òtù ha nwere ike, were Igbo na-akpanyere ụmụ anyị ụka, ka ihe ihere dị otu a hapụ ị na-eme n’èzí.
Ụtọasụsụ Igbo dị mkpa ụmụaka anyị ịmụta, were bekee kpọọrọ ya aka maka na ọ̀kwà gwara ụmụ ya, ha tụrụ ji ha tụrụ mkpọrọgwụ maka ụbọchị onye nwe ji ga-egwuru ji ya ka ha tụrụwa mkpọrọgwụ.
Isi okwu m wee bụrụ na Igbo ga-adị.

1 comment: